Ọkpụkpọ òkù ka e tinye arịrịọ ọnụahịa maka ọrụ E bipụtara: Ọktoba 16, 2018
1.0 Okwu mmalite
Dịka akụkụ nke mbọ iji nkà na ụzụ meziwanye ọrụ azụmahịa ya iji bawanye mmepụta na ịdị irè, Securities and Exchange Commission, Nigeria na-akpọ ụlọ ọrụ nwere ikike, ntụkwasị obi na ntozu ka ha tinye ọnụahịa n’akụkụ abụọ (nke nkà & nke ego) maka ịrụ ọrụ a kọwara n’akwụkwọ ịkpọ oku maka ọnụahịa (IFB):
2.0 Ihe ọrụ ahụ gụnyere
Ịnye Securities and Exchange Commission kọmputa laptọọpụ
Nkọwa na oke ọrụ nkwekọrịta ahụ dị n’akwụkwọ ịkpọ oku maka ọnụahịa (ITT).
3.0 Ihe a chọrọ iji ruo eru
4.0 Ịnata akwụkwọ ntinye arịrịọ ọnụahịa
Ụlọ ọrụ ICT nwere mmasị na ikike ịrụ ọrụ a kwesịrị ịnara akwụkwọ ọnụahịa n’aka Odeakwụkwọ Bọọdụ ịtụle ọnụahịa nke Kọmishọn, Ngalaba P&SS, Isi Ọfịs, SEC Tower, Plot 272, Samuel Adesujo Ademulegun Street, Central Business District, Abuja, mgbe ha kwụrụ ụgwọ N10,000.00 (puku naira iri naanị) a na-agaghị akwụghachi.
A ga-akwụ ụgwọ ahụ site na “Remita Link” nke Kọmishọn dịka e gosiri na weebụsaịtị Securities And Exchange Commission, Nigeria.
5.0 Ịnyefe arịrịọ ọnụahịa
A ga-enyefe ọnụahịa nke nkà na nke ego n’ime envelopu abụọ dị iche iche tupu ma ọ bụ n’elekere 12:00 nke ehihie na Tuzdee, 27 Nọvemba, 2018, dịka ndị a:
A. A ga-etinye arịrịọ nke nka n’ime envelopu e mechiri emechi, dee “Technical Bid” nke ọma n’akụkụ aka ekpe elu ya, ma gosikwa aha ọrụ ahụ.
B. A ga-etinye arịrịọ nke ego n’ime envelopu ọzọ e mechiri emechi, dee “Financial Bid” nke ọma n’akụkụ aka ekpe elu ya, ma gosikwa aha ọrụ ahụ.
A ga-edegara envelopu abụọ ahụ adreesị a:
Odeakwụkwọ,
Bọọdụ ịtụle ọnụahịa,
Securities and Exchange Commission,
Ala mbụ dị n’elu ala, SEC Tower,
Plot 272, Samuel Adesujo Ademulegun Street,
Central Business District, Abuja
A ga-eweghachi arịrịọ e nyefere n’oge gafere n’emepeghị ya.
6.0 Imeghe arịrịọ ọnụahịa
A ga-emeghe arịrịọ ọnụahịa nke nka n’elekere 12:00 nke ehihie na Tuzdee, 27 Nọvemba, 2018, n’Isi Ọfịs SEC dị na Abuja. A na-akpọ ndị niile tinyere arịrịọ, ndị NGO na ọha na eze ka ha bịa na mmeghe arịrịọ ahụ.
7.0 Ajụjụ
A ga-ezigara ajụjụ niile gbasara mgbasa ozi a n’aka Odeakwụkwọ,
Bọọdụ ịtụle ọnụahịa, n’adreesị e kwuru na 5.0 n’elu (n’agbata elekere 10.00 am na 4.00 pm. naanị n’ụbọchị ọrụ) ma ọ bụ kpọọ 09-4621120 na 09-4621163
8.0 Ozi dị mkpa
A binyere aka
NDỊ NCHỊKWA