Ikpe Federal High Court Banyere BARA Finance & Investment Ltd na Ndị Nlekọta/Ndị Kwalitere Ya E bipụtara: Ọgọọst 5, 2021
Securities and Exchange Commission (“Kọmishọn ahụ”) chọrọ ịdọrọ uche ọha na eze n’ikpe Federal High Court nke nọ ọdụ na Abuja nyere na 28 Juun 2021, gbasara BARA FINANCE & INVESTMENT LTD, nke a mara ụlọ ọrụ ahụ nakwa MAAZỊ EDE AGIDA PETERS na OLOM OJEBONG JACOB ikpe maka ịrụ ọrụ ahịa isi ego n’ụzọ megidere iwu na ịhazi atụmatụ itinye ego a na-edebanyeghị aha, nke megidere ndokwa nkebi 38, 54 na 67 nke Investments and Securities Act 2007.
Ụlọikpe ahụ tụrụ MAAZỊ EDE AGIDA PETERS na MAAZỊ OLOM OJEBONG JACOB mkpọrọ otu afọ na Nigerian Correctional Centre, n’enweghị nhọrọ ịkwụ ụgwọ ntaramahụhụ. Ụlọikpe ahụ ekwughị ihe ọ bụla banyere arịrịọ Kọmishọn ahụ ka ndị a gbara akwụkwọ megide ha weghachite ego niile fọdụrụ ha ji “ndị na-etinye ego” ha.
Kọmishọn ahụ na-ekwughachi na BARA FINANCE & INVESTMENT LTD na ndị guzobere ya EDEBANYEGHỊ aha ịrụ ọrụ n’ahịa isi ego Naịjirịa. N’ihi ya, a na-adụ ọha na eze ọdụ siri ike ka ha kwụsị iso ụlọ ọrụ ahụ mee azụmahịa ma ọ bụ itinye ego ọ bụla metụtara ahịa isi ego, ma ọ bụ iso ndị a kpọrọ aha n’elu nke Federal High Court mara ikpe mekọọ ihe n’ụzọ ọzọ.
A BINYERE AKA
NDỊ NCHỊKWA