Ọgbakọ Ndị Ahịa Isi Ego Naịjirịa na-amalite atụmatụ iji kwado ọgụ megide COVID-19 E bipụtara: Eprel 21, 2020
Mgbe a kwadoro onye mbụ nwere COVID-19 na Naịjirịa na 27 Febrụwarị 2020, ma chọpụtakwa ndị ọzọ mechara nwee ya, gọọmentị etiti na nke steeti ewebatala ọtụtụ usoro iji gbochie mgbasa ọrịa ahụ. Ngalaba nkeonwe akwadokwala gọọmentị n'ọrụ igbochi mgbasa ya na ibelata ihe isi ike akụ na ụba na ahụike ọrịa ahụ kpatara.
Ọ bụ ezie na ndị ahịa isi ego Naịjirịa na-amata mbọ a na-agba ugbu a iji nye ndị Naịjirịa ngwa ahụike dị oke mkpa na enyemaka, ha ghọtara na a ka ga-eme ọtụtụ ihe, karịchaa maka ndị kachasị nwee mkpa n'obodo anyị.
N'ihi nke a, ndị ahịa isi ego Naịjirịa, nke Securities and Exchange Commission na-edu, guzobere kọmitii nke ahịa ahụ dum na Tọzdee, 16 Eprel 2020, nke aha ya bụ Kọmitii Nkwado Ahịa Isi Ego Maka Covid-19, iji hazie mbọ ndị ahịa isi ego na-agba ibelata mmetụta ọrịa ahụ nwere n'ahụike na akụ na ụba ndị kachasị nwee mkpa na ndị na-enweghị nnukwu ohere.
Kọmitii ahụ amalitela ọrụ ma setịpụ ihe mgbaru ọsọ ịnakọta otu ijeri naịra (N1,000,000,000) n'aka ndị na-eso ahịa na ndị metụtara ya n'ime oge kacha nta enwere ike. A ga-eji ego ahụ nye ndị dara ogbenye enyemaka na akụrụngwa ọgwụgwọ nye ụlọ ọgwụ na ebe iche ndị ọrịa a họpụtara.
Oge a siri ike nye onye ọ bụla, ndị ahịa isi ego enweghịkwa ike ịnọ n'akụkụ n'ọgụ megide COVID-19.
Anyị na-arịọ ndị Naịjirịa ibe anyị ka ha gaa n'ihu na-eme ihe nchekwa niile dị mkpa ma rube isi n'iwu niile gọọmentị etiti na ụlọ ọrụ ya ndị metụtara ya nyere.
Anyị niile ga-emeri ọrịa a ọnụ.
A binyere aka
Ndị Nchịkwa
Securities and Exchange Commission